Ọ we rue, mb͕e ubọchi atọ gasiri, ha hu Ya n'ulo Chineke, ka Ọ nọduru n'etiti ndi-ozizí, nānu okwu-ha, nāju kwa ha ajuju: ibobo nghọta-Ya na ọziza nile Ya we nwua ndi nile nuru okwu-Ya n'aru. Mb͕e ha huru Ya, egwu wee tua ha n'aru: nne-Ya we si Ya, Nwam, Gini mere I meso ayi otú a? le, nna-Gi na mu onwem nāchọ Gi n'obi ufu. O we si ha, Gini mere unu nāchọm? ùnu amataghi na aghaghm idi n'ihe nke Nnam? Ma ha onwe-ha aghọtaghi okwu Ọ gwara ha. O we so ha rida, bia rue Nazaret; Ọ we nọdu n'okpuru ha: nne-Ya we nēdebe ihe nile ekwuru n'obi-ya. Jisus we nāga n'iru n'amam-ihe na ogologo, nāga kwa n'amara n'ebe Chineke na madu nọ.
Gụọ LUK 2
Geere nke a ntị LUK 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 2:46-52
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị