Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 2:25-38

LUK 2:25-38 IGBOB

Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya. Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi. O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di, ya onwe-ya we nara Ya nke-ọma, kuru Ya n'aka-ya, gọzi kwa Chineke, si, Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ la N'udo, dika okwu-Gi si di; N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi, Nke I doziri n'iru ndi nile; Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ, Na ebube ndi-Gi, bú Israel. Ihe ekwuru bayere Ya we nēju kwa nna-Ya na nne-Ya anya; Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide; ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta. Otù onye anākpọ Ana di kwa, bú onye-amuma-nwanyi, nwa-nwanyi Fanuel, nke si n'ebo Asha puta (nwanyi a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di-ya biri arọ asa site na nwa-ab͕ọghọ-ya, o we nọdu n'ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n'ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie. O we bia rue ebe ahu n'otù oge hour ahu, we kele Chineke, gwa kwa ndi nile nēche nb͕aputa nke Jerusalem okwu bayere Ya.