Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 15:11-24

LUK 15:11-24 IGBOB

O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua: nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri. Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì. Ma mb͕e o mefusiri ihe nile, oké unwu siri ike dara n'ala ahu; ya onwe-ya we malite inọ na nkpà. O we ga were onwe-ya rapara n'otù onye nime ndi amuru n'ala ahu; o we ziga ya n'ubi-ya izù ezì. O we nāgu ya iwere mb͕ub͕ọ nke ezì nāta riju afọ-ya: ma ọ dighi onye ọ bula nēnye ya. Ma mb͕e ọ mara onwe-ya ọ si, Ọ̀tutu ndi egoro ọlu ole nke nnam nwebigara ob͕e achicha ókè, ma mu onwem nāla n'iyì n'oké agu n'ebe a! M'gebili jekuru nnam, m'gāsi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ: mem ka m'di ka otù onye nime ndi nke gi egoro ọlu. O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n'ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n'aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n'olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku. Nwa-ya we si ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ. Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya: sekputa kwa nwa-ehi azùru azù, b͕ue ya, ka ayi ri kwa, ka obi tọ kwa ayi utọ: n'ihi na nwam nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fururi efu, ewe hu ya. Ha we malite ime ka obi tọ ha utọ.