Ma ufọdu nọ n'ebe ahu n'oge ahu ndi kọrọ Ya akukọ bayere ndi Galili ahu, ndi Pailat were ọbara-ha gwakọta n'àjà-ha. O we za, si ha, Ùnu nēchè na ndi Galili ndia bu ndi-nmehie kari ndi Galili nile, n'ihi na ha ahuwo ahuhu ndia? Asim unu, É-è: kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú ahu. Ma-ọbu madu iri na asatọ ahu, ndi ulo-elu di na Sailoam dakwasiri ha, we b͕ue ha, ùnu nēchè na ndi ahu bu ndi ji ugwọ kari madu nile ndi bi na Jerusalem? Asim unu, É-è; kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú a. O we tua ilu a; Otù onye nwere osisi fig akuru n'ubi-vine-ya; o we bia nāchọ nkpuru n'elu ya, ma ọ hughi. O we si onye-ọlu-vine-ya, Le, site n'arọ atọ rue ub͕u a ka m'nābia nāchọ nkpuru n'osisi fig a, ma ahughm: b͕utue ya; gini mere ọ nēme kwa ka ala la n'iyì? O we za, si ya, Onye-nwe-ayi, rapu kwa ya arọ a, rue mb͕e m'gēgwu ala-ya buruburu, wusa kwa ya ǹsí-anu: ọ buru kwa na ọ mia nkpuru site n'ub͕u a, ọ di nma; ma ọ buru na ọ mighi, i gēb͕utu ya.
Gụọ LUK 13
Geere nke a ntị LUK 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 13:1-9
5 Days
Repentance is one of the key actions we all take in coming to know Christ as our personal Savior. Repentance is our action and forgiveness is God's reaction to us out of His perfect love for us. During this 5-day reading plan, you will receive a daily Bible reading and a brief devotional designed to help you better understand the importance of repentance in our walk with Christ. For more content, check out www.finds.life.church
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị