Ma le, otù onye-iwu biliri, we nwa Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi? O we si ya, Gini ka edeworo n'akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya? O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya site n'obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu. Ma ebe ọ nāchọ igu onwe-ya n'onye ezi omume, ọ si Jisus, Ònye bu kwa onye-ab͕ata-obim? Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n'etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ. Ma n'otù mb͕e ahu otù onye-nchu-àjà nārida n'uzọ ahu: mb͕e ọ huru ya, o we si n'akuku uzọ ọzọ gabiga.
Gụọ LUK 10
Geere nke a ntị LUK 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 10:25-31
7 Days
New Year. A New Day. God created these transitions to remind us that He is the God of New Beginnings. If God can speak the world into existence, He can certainly speak into the darkness of your life, creating for you a new beginning. Don’t you just love fresh starts! Just like this reading plan. Enjoy!
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị