N'oge hour ahu tọrọ Ya utọ nke-uku nime Mọ Nsọ, O we si, Ekelem Gi, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna; ekelem Gi na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi. Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mara Onye Ọkpara ahu bu, ma-ọbughi Nna-Ya; na Onye Nna ahu bu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya. Mb͕e O chigharisiri n'ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, O we si n'iche, Ngọzi nādiri anya nāhu ihe unu nāhu: n'ihi na asim unu, na ọtutu ndi-amuma na ndi-eze chọrọ ihu ihe unu onwe-unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.
Gụọ LUK 10
Geere nke a ntị LUK 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 10:21-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị