Ma mb͕e ihe ndia gasiri Onye-nwe-ayi guputara ọgu ndikom atọ na iri di iche, we zipu ha abua abua ka ha ga n'iru Ya ba n'obodo na ebe ọ bula, ebe Ya onwe-ya gaje ibia. O we si ha, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole: ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu ba n'owuwe-ihe-ubi-Ya. Jenu: le, Mu onwem nēzipu unu dika umu-aturu n'etiti agu. Unu ewela àkpà-ego, ma-ọbu àkpà-ije, ma-ọbu akpukpọ-ukwu: unu ekele-kwa-la onye ọ bula n'uzọ. Ma ulo ọ bula unu gābà nime ya, burunu uzọ si, Udo diri ulo a. Ọ buru kwa na onye-udo nọ n'ebe ahu, udo-unu gānọkwasi ya: ma ọ buru na onye-udo anọghi ya, udo-unu gālaghachiri unu ọzọ. Nọgide-kwa-nu n'ulo ahu, nēri nāṅu kwa ihe ha nēnye umu: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya. Unu esila n'otù ulo ba n'ulo ọzọ. Nime obodo ọ bula unu gābà kwa, ha we nara unu nke-ọma, rienu ihe edebere n'iru unu: mekwanu ndi aru-ha nādighi ike nọ n'ebe ahu ka aru-ha di ike, si-kwa-nu ha, Ala-eze Chineke di unu nso. Ma nime obodo ọ bula unu gābà, ma ha anaraghi unu nke-ọma, puanu n'amá-ya, si, Ọbuná ájá si n'obodo-unu, nke rakuru n'ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso.
Gụọ LUK 10
Geere nke a ntị LUK 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 10:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị