Jehova we gwa Moses okwu, si, Nye Eron na umu-ya ndikom iwu, si, Nka bu iwu nke àjà-nsure-ọku: nke ahu bu àjà-nsure ọku bayere orire-ọku n'elu ebe-ichu-àjà ogologo abali nile rue ututu, agēme kwa ka ọku ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya. Onye-nchu-àjà gēyiri kwa uwe-nwuda ákwà ọcha ya, uwe-ukwu ákwà ọcha ya ka o gēyikwasi kwa n'anu-aru-ya; ọ gāchili kwa ntu ahu nke ọku gērechaputa n'àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà, dọba ha na nso ebe-ichu-àjà. O gēyipu uwe-ya, yiri uwe ọzọ, bupu ntu ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, rue ebe di ọcha. Agēme kwa ka ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya, ọ gaghi-anyu anyu; onye-nchu-àjà gēsure nkú ọku n'elu ya kwa-ututu: o gēdo kwa àjà-nsure-ọku n'usoro n'elu ya, sure kwa abuba nke àjà-udo nile ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya. Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu.
Gụọ LEVITIKỌS 6
Geere nke a ntị LEVITIKỌS 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LEVITIKỌS 6:8-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị