ABÙ-ÁKWÁ 3:22-66
ABÙ-ÁKWÁ 3:22-66 IGBOB
O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya. Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata. Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya. Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi. Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ. N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di. N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru. Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu, Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu, Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma. Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu? Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa? Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile? Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova. Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua. Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi. I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko. I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga. Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche. Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi. Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia. Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim. Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi, Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu. Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom. Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu. Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume. Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom. Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova. Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum. I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu. Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum. Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem. I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum. I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem; Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile. Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara. I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di. I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha. I gāchu ha n'iwe, kpochapu ha n'okpuru elu-igwe nke Jehova.


