Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya. Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè. N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile. O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile. O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu. N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi. Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́. Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ. O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ.
Gụọ ABÙ-ÁKWÁ 3
Geere nke a ntị ABÙ-ÁKWÁ 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ-ÁKWÁ 3:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị