Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.
Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè.
N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile.
O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile.
O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu.
N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.
Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́.
Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ.
O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ.
Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche.
Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m'tọb͕ọrọ n'efu.
Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú.
O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua.
Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile.
O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ.
O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu.
I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma.
M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.
Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.
Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem.
Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere.
O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.
Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.
Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.
Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.
Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.
Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.
Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya.
Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi.
Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.
N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi.
N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.
N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru.
Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu,
Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu,
Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma.