JOSHUA 21:43-45
JOSHUA 21:43-45 IGBOB
Jehova we nye Israel ala ahu nile nke Ọ ṅuru iyi inye ndi bu nna-ha; ha we nweta ya, we biri nime ya. Jehova we me ka ha zuru ike buruburu, dika ihe nile si di nke Ọ ṅuru ndi bu nna-ha iyi: ọ dighi kwa nwoke ọ bula n'etiti ndi-iro-ha nile guzoro n'iru ha; ndi-iro-ha nile ka Jehova nyere n'aka-ha. Ọ dighi ihe ọ bula dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova gwara ulo Israel; ha nile mere.

