Jona we si n'afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya, ekpere. O we si, Esirim n'ahuhum kpọkue Jehova, O we zam; N'afọ ala-mọ ka m'siri tikue Ya, I nuru olum. N'ihi na I tubàram nime miri di omimi, n'etiti oké osimiri nile, Osimiri dikwam buruburu; Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n'isim. Mu onwem we si, Achupuwom n'iru anya-Gi abua; Otú ọ di, m'gēlegide kwa anya ọzọ n'ebe ulo uku Gi di nsọ di. Miri b͕aram buruburu, rue nkpuru-obi; Ob͕u-miri dim buruburu; Achara-miri kukurum n'isi. Rue ala ugwu nile ka m'ridara; Ala, ihe-ntuchi-ya nile kpachitaram rue mb͕e ebighi-ebi: Ma I mewo ka ndum si n'olùlù rigoputa, Jehova, bú Chinekem.
Gụọ JONA 2
Geere nke a ntị JONA 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JONA 2:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị