Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOEL 2:25-28

JOEL 2:25-28 IGBOB

M'gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M'zitere n'etiti unu. Unu gēriju afọ, afọ ewe ju unu, unu ewe to aha Jehova, bú Chineke-unu, Onye mesoworo unu n'ilu oké ọlu: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e ebighi-ebi. Unu gāma kwa na n'etiti Israel ka M'nọ, na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, na ọ dighi onye ọzọ: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e abighi-ebi. O gēru kwa ma emesia, na M'gāwusa Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù