Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 42:1-5

JOB 42:1-5 IGBOB

Job we za Jehova, si, Amawom na I puru ime ihe nile, Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi. Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n'enweghi ọmuma-ihe? N'ihi ya ka m'gosiworo ihe nke m'nādighi-aghọta, Ihe dikaririm ebube, nke m'nādighi-amata. Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa; M'gāju Gi, Gi me kwa ka m'mara. Site n'ọnunu nti ka m'nuru Gi; Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi.