Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu, Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ. N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa, Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha. N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa, Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere. Iku-ume-ya nāmunye icheku, Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta. N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya, Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú. Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha: O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya. Obi-ya siri ike dika nkume; O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri. Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ: Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ. Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike; Ya na ube, na àkú, na uwe-agha. Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka, Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure. Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga: Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka. Anāgu ndele n'ahihia-ọka: Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì. Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ: Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti. Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite: Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ. Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya; Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ. Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa, Nke emeworo nēnweghi ujọ. Ihe nile nke di elu ka ọ nāhu: Ya onwe-ya bu eze anu-ọhia nile di nganga.
Gụọ JOB 41
Geere nke a ntị JOB 41
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOB 41:18-34
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị