Ì mawo mb͕e ewu-ọhia nke nkume di elu ji amu nwa? Ì nāriba ama mb͕e nne-ele nāmuputa nwa? Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n'imu nwa ọnu? Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa? Ha nēruru ala, muputa umu-ha, Tuzuga ihe-nb͕u-ha. Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n'ọhia; Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha. Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya? Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia? Nke M'meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya, Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya. Ọ nāchì ùzù obodo ọchì, Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n'ihe-ike. Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya, Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ. Àtu gēkwe ibu orù-gi? Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n'akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi? Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi? Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari? Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne? Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu? Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi, Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi? Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu; Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere? N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala, Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá, O we chezọ na ukwu gāzọpia ha, Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu. O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere: Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu; N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe, O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.
Gụọ JOB 39
Geere nke a ntị JOB 39
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOB 39:1-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị