Jehova we si n'oké ifufe za Job, si, Ònye bu onye a nke nēme ka ndum-ọdu b͕a ọchichiri Site n'okwu ọmuma-ihe nādighi? Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju kwa gi, gi me kwa ka M'mara. Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa? Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta. Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara? Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya? N'èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie? Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya, Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù, Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike? Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri, Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta; Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya, Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya, M'we kpawara ya ókèm, Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ, Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya; N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile? Site na nmalite ubọchi-gi ọ̀ di mb͕e i nyere ututu iwu, Me chi-ọbubọ ka ọ mara ọnọdu-ya; Ka o we jide akuku nile nke uwa aka, Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu? Ọ nāb͕anwe onwe-ya dka urọ akàrà; Ha nēguzo kwa onwe-ha dika uwe: Anēb͕ochi kwa ìhè-ha n'ebe ndi nēmebi iwu nọ, Anānyaji kwa ogwe-aka di elu. Ì bàwo n'ebe-nsuputa nile nke oké osimiri? Ma-ọbu ì jeghariwo n'ebe michasiri emi nke ob͕u-miri? Èkpugheworo gi ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu? Ma-ọbu ì nāhu ọnu-uzọ-ama nke onyinyo ọnwu? Ì ghọtawo rue obosara uwa? Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya.
Gụọ JOB 38
Geere nke a ntị JOB 38
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOB 38:1-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị