Anēsi n'iku-ume Chineke nye ice: Anēme kwa obosara miri ka ọ di warara. Ọzọ, O nēji miri-ozuzo bob͕u oké igwe-oji; Ọ nāb͕asa igwe-oji nke ìhè-Ya: Anēchighari kwa nke ahu buruburu site n'okpukpe-Ya, Ka ha we me ihe ọ bula nke Ọ nēnye ha n'iwu N'elu-uwa dum madu bi: Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya, Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue. Ṅa nti na nka, Job: Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke. Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu, Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua? Ì mara otú oké igwe-oji ji kwuru efekefe, Oké ọlu nke Onye zuru okè n'ọmuma-ihe? Gi onye uwe-gi nēkpo ọku, Mb͕e Ọ nēme ka uwa di jū site n'ifufe Ndida. Ì gēso Ya me ka mbara-ígwé nile sa mbara, Nke di ike dika enyo awuru awu? Me ka ayi mara ihe ayi gāsi Ya; Ayi adighi-edo okwu-ayi n'usoro n'ihi ọchichiri. Àgākọrọ Ya na m'gēkwu okwu? Ma-ọbu ọ̀ di madu ọ bula siri ka eloda ya? Ma ub͕u a madu ahughi ìhè nke nēb͕upu na mbara-ígwé: Ifufe we gabiga, me ka ha di ọcha. N'Ugwu ka ọla-edo, bú ọmùmù-ìhè, nēsi bia: Chineke ka ebube di egwu nādikwasi. Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike: N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala. N'ihi ya madu nātu egwu Ya: Ọ dighi-ahu ndi nile obi-ha mara ihe.
Gụọ JOB 37
Geere nke a ntị JOB 37
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOB 37:10-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị