Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 33:8-27

JOB 33:8-27 IGBOB

N'ezie i kwuwo na ntim, Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si, Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie; Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem: Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa, Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ; O nētiye ukwum abua nime ọtọsi, Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya. Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi: N'ihi na Chineke di uku kari madu. Gini mere i ji so Ya se okwu, Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme? N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu, E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama. Na nrọ, bú ọhù nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu, N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina; Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu, Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà, Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya, Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako; Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù, Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha. Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya, Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile: Nri we nāsọ ndu-ya oyi, Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi. Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya; Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu. Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù, Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua. Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya, Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri, Igosi madu izi-ezi-ya; Ọ gēme-kwa-ra ya amara, si, Dọputa ya n'irida n'olùlù, Achọtawom ihe-nb͕aputa. Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwata Ọ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya: Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ; O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya: O we nyeghachi madu ezi omume-ya. Ọ nābù abù n'iru madu, si, Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume, Ma ọ baghm n'ihe