JOB 32:1-10
JOB 32:1-10 IGBOB
Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya. Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n'ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ọ guru onwe-ya n'onye ezi omume kari Chineke. Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe. Ma Elaihu chere Job n'ikwu okwu, n'ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n'ubọchi ndu-ha. Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n'onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku. Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si, Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká; N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara. Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu, Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe. N'ezie mọ di nime madu, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe. Ọ bughi ndi uku mara ihe, Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé. N'ihi nka ka m'siri, Gem nti; M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.

