Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya. Job we za, si: Ka ubọchi nke amurum nime ya la n'iyì, Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke. Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri; Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya, Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya. Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya; Ka igwe-oji biri n'elu ya; Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku. Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya: Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n'etiti ubọchi nile nke arọ; Ka ọ ghara ibata n'ọnu-ọgugu ọnwa. Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà; Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya. Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu, Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan. Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri: Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa; Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya: N'ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m'si nime ya puta, O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n'anyam. N'ìhi gini ka m'nēsighi n'àkpà-nwa nwua? N'ìhi gini ka m'nāputaghi n'afọ kubìe ume? Gini mere ikperè abua di n'irum inaram? Ma-ọbu ara, ka m'we ṅua? N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jū M'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim: Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa, Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe; Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo, Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha: Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo; Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè? N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu; Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike. N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū; Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike. Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua; Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya. N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè? N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu? Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia; Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo; Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù, Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì. N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè, Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya? N'ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia, Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri. N'ihi na oké egwu ka m'turu, o we biakwasim, Ihe nke m'turu ujọ biakute-kwa-ram. Anọghm n'udo, anọghkwam jū, ezughkwam ike; Ma ime-nkpatu biara.
Gụọ JOB 3
Geere nke a ntị JOB 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOB 3:1-26
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị