Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya. Job we za, si: Ka ubọchi nke amurum nime ya la n'iyì, Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke. Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri; Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya, Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya. Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya; Ka igwe-oji biri n'elu ya; Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku. Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya: Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n'etiti ubọchi nile nke arọ; Ka ọ ghara ibata n'ọnu-ọgugu ọnwa. Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà; Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya. Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu, Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan. Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri: Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa; Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya: N'ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m'si nime ya puta, O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n'anyam.
Gụọ JOB 3
Geere nke a ntị JOB 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOB 3:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị