Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 19:13-27

JOB 19:13-27 IGBOB

O mewo ka umu-nnem nọpurum n'ebe di anya, Ndi maworom we ghọ nání ndi ala ọzọ n'ebe m'nọ. Ndi-ab͕ata-obim akwusiwo, Ndi m'mara echezọwokwam. Ndi nọ n'ulom dika ọbìa na ndi-orum nwayi nāgum n'onye ala ọzọ: Onye anāmataghi ka m'ghọworo n'anya-ha. Akpọwom arùm òkù, ma ọ dighi-azam, Anameji ọnum riọ ya aririọ-amara. Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n'ebe nwunyem nọ, Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara. Ọbuná umu nāṅu ara ajuwom; Ọ buru na ebiliem, ha we nēkwugidem. Ndi-ìzum nile nākpọm ihe-árú: Ndi ahu m'huru n'anya echighariwo imegidem. Ọkpukpum nārapara n'akpukpọ-arum na n'anu-arum, M'we were akpukpọ ezém wepuga onwem. Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm; N'ihi na aka Chineke emetuwom n'aru. N'ìhi gini ka unu nāchum dika Chineke? N'ìhi gini ka anu-arum adighi-eju unu afọ? Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n'akwukwọ ub͕u a! Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n'akwukwo! Ma asi na eji pen ígwè na òpù Ka ha n'oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi! Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu, Na O gēbili kwa ọtọ n'elu ájá n'ikpe-azu: Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka, Ọ bu na m'gēsi n'anu-arum hu Chineke: Onye mu onwem gāhuru onwem, Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ. Akurum abua agwusiwo n'imem.