Zofa, bú onye Neama, we za, si, Àgaghi-aza ọtutu okwu? Àgāgu kwa onye eb͕ub͕ere-ọnu n'onye ezi omume? Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti; I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi. I we si, Nmutam di ọcha, M'di kwa ọcha n'anya-Gi. Ma otú ọ di, ọ gādim nọ̄ nma ma asi na Chineke ekwue okwu, Saghe eb͕ub͕ere-ọnu-Ya megide gi; Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe, Na ọ di okpukpu n'izube ihe. Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi. Ì gēsi n'ogwugwu chọputa Chineke? Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu? Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme? Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara? Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa, Di kwa obosara kari oké osimiri. Ọ buru na Ọ ga n'iru, mechibido madu uzọ, Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi? N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu: Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya. Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi, Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.
Gụọ JOB 11
Geere nke a ntị JOB 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOB 11:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị