Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 6:1-40

JỌN 6:1-40 IGBOB

Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus jere n'ofè ọzọ nke oké osimiri Galili, nke bu osimiri Taibirias. Oké ìgwè madu we so Ya, n'ihi na ha huru ihe-iriba-ama di iche iche nke Ọ nēme n'aru ndi aru-ha nādighi ike. Jisus we rigo n'ugwu ahu, n'ebe ahu ka Ya na ndi nēso uzọ-Ya nọdu-kwa-ra ala. Ma ngabiga, bú ememe ndi-Ju, di nso. Ya mere Jisus, mb͕e O weliri anya-Ya elu, hu na oké ìgwè madu nābiakute Ya, Ọ si Filip, Òle ebe ayi gāzuta ob͕e achicha, ka ndia we rie ihe? Ma nka ka O kwuru inwa ya: n'ihi na Ya onwe-ya matara ihe Ọ gāje ime. Filip zara Ya, Ob͕e achicha ọgu shilling iri agaghi-ezu ha, ka madu nile n'otù we were nke-ntà nke-ntà. Otù nime ndi nēso uzọ-Ya, bú Andru nwa-nne Saimon Pita, si Ya, Otù nwa-okoro ntà nọ n'ebe a, onye ji ob͕e achicha barley ise, na azù abua: ma ǹdia bu gini n'etiti ọtutu madu di otú a? Jisus siri, Menu ka madu ndia nọdu ala. Ma ahihia riri nne n'ebe ahu. Ya mere ndikom ahu we nọdu ala, n'ọnu-ọgugu ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri. Ya mere Jisus nara ob͕e achicha ise ahu, we kele, we kèsa ha nye ndi nānọdu ala; otú ahu O were azù ahu kèsa nye ha ka azù ha chọrọ ra. Ma mb͕e afọ juru ha, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Chikọtanu iberibe fọduru, ka ihe ọ bula ghara ila n'iyì. Ya mere ha chikọtara ha, we kpoju nkata iri na abua n'iberibe sitere n'ob͕e achicha barley ise ahu, nke fọduru ndi riworori. Ya mere mb͕e ndi ahu huru ihe-iriba-ama O mere, ha siri, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu nke nābia n'uwa. Ya mere mb͕e Jisus huru na ha gaje ibia idọkpuru Ya n'ike, ka ha we me Ya eze, O wezugara Onwe-ya ọzọ n'ugwu nání Ya onwe-ya. Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya ridara n'oké osimiri; ha we ba n'ub͕ọ, we nāgabiga ofè oké osimiri ọzọ iga ru Kapanaum. Ọchichiri ab͕awo-kwa-ri ub͕u a, Jisus akābiakuteghi kwa ha. Oké osimiri nēbili kwa, n'ihi na oké ifufe nēfe. Ya mere mb͕e ha nyasiri ihe dika orú furlong na ise ma-ọbu orú na iri, ha hu Jisus ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, nābiaru kwa ub͕ọ-ha nso: ha we tua egwu. Ma Ọ siri ha, Ọ bu Mu onwem; unu atula egwu. Ya mere ha chọrọ iwebata Ya nime ub͕ọ-ha: ngwa ngwa ub͕ọ-ha we rue ala ebe ha nāga. N'echi-ya, ìgwè madu ndi guzoro n'ofè ọzọ nke oké osimiri ahu huru na ub͕ọ ntà ọzọ adighi n'ebe ahu, ma-ọbughi otù, hu kwa na Jisus esoghi ndi nēso uzọ-Ya ba n'ub͕ọ-ha, kama na nání ndi nēso uzọ-Ya jere; (otú ọ di, ub͕ọ ntà di iche iche sitere na Taibirias bia rue ebe ahu nso ebe ha riri achicha ahu mb͕e Onye-nwe-ayi kelesiri ekele): ya mere mb͕e ìgwè madu ahu huru na Jisus anọghi n'ebe ahu, na ndi nēso uzọ-Ya anọghi kwa, ha onwe-ha bàra n'ub͕ọ ntà, we bia Kapanaum, nāchọ Jisus. Mb͕e ha chọputara Ya n'ofè oké osimiri ọzọ, ha si Ya, Rabai, òle mb͕e I biara n'ebe a? Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asi m unu, Unu nāchọm, ọ bughi n'ihi na unu huru ihe-iriba-ama kama ọ bu n'ihi na unu riri ufọdu nime ob͕e achicha ahu, afọ ju kwa unu. Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà. Ya mere ha siri Ya, Gini kwesiri ka ayi me, ka ayi we lua ọlu Chineke nile? Jisus zara, si ha, Nka bu ọlu Chineke, ka unu kwere n'Onye ahu Ya onwe-ya zitere. Ya mere ha siri Ya, Gini kwa ka Gi onwe-gi nēme ka ọ buru ihe-iriba-ama, ka ayi we hu, kwere kwa Gi? gini ka I nālu? Nna-ayi-hà riri manna n'ọhia; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Nri nke sitere n'elu-igwe ka O nyere ha ka ha rie. Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ bughi Moses nyere unu nri ahu nke sitere n'elu-igwe; kama ọ bu Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n'elu-igwe. N'ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n'elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu. Ya mere ha siri Ya, Onye-nwe-ayi, nye ayi nri a mb͕e nile. Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula. Ma asirim unu, na unu ahuwom, ma unu ekweghi. Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M'gaghi-achupu ya ma-ọli. N'ihi na esiwom n'elu-igwe ridata, ọ bughi ka M'nēme ihe Mu onwem nāchọ, kama ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ. Ma nka bu ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'ghara itufu ihe ọ bula nime ihe nile O nyeworo m, kama ka M'me ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.