Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 4:4-19

JỌN 4:4-19 IGBOB

Ma Ọ ghaghi igabiga n'etiti Sameria. Ya mere Ọ bia rue otù obodo nke Sameria, anākpọ Saika, na nso iberibe ala ahu nke Jekob nyere nwa-ya Josef: ma isi-iyi Jekob di n'ebe ahu. Ya mere Jisus, ebe ike gwuru Ya n'ije-Ya, Ọ nọduru ala otú a n'usọ isi-iyi ahu. Ọ ra ka oge hour nke-isi. Otù nwanyi, bú onye Sameria, bia isere miri: Jisus si ya, Nyem miri ka M'ṅua. N'ihi na ndi nēso uzọ-Ya jeriri n'obodo izu nri. Ya mere nwanyi Sameria ahu si Ya, Gì onwe-gi si aṅa ariọ miri n'akam ka I ṅua, ebe I bu Onye-Ju, ma mu bu nwanyi Sameria? (N'ihi na ndi-Ju na ndi Sameria adighi-emekọ ihe.) Jisus zara, si ya, Ọ buru na i matara onyinye Chineke, na Onye Ọ bu Nke nāsi gi, Nyem miri ka M'ṅua; gi onwe-gi gāriọ Ya-ri, Ọ gēnye kwa gi miri di ndu. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, I nweghi ihe isere miri, ma olùlù-miri a di omimi: òle ebe kwa ka I nwere miri ahu di ndu? Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Jekob uku, onye nyere ayi olùlù-miri a; ya onwe-ya, na umu-ya, na anu-ulo-ya, ṅu-kwa-ra nime ya? Jisus zara, si ya, Onye ọ bula nke nāṅu miri a, akpiri gākpọ ya nku ọzọ: ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, nyem miri a, ka akpiri we ghara ikpọm nku, ka m'ghara kwa isi n'ogologo uzọ a nile bia ebe a isere miri. Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n'ebe a. Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di: n'ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ub͕u a abughi di-gi: nka ka i kwuworo n'ezie. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma.