JỌN 15:7-9
JỌN 15:7-9 IGBOB
Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya. Nime nka ka anēnye Nnam otuto, ka unu nāmi nkpuru ri nne; unu gābu kwa ndi nēso uzọm. Dika Nnam hurum n'anya, Mu onwem hu-kwa-ra unu n'anya: nọgidenu nime ihu-n'anyam.


