Ya mere mb͕e ọ pururi, Jisus si, Ub͕u a ka enyere Nwa nke madu otuto, enye-kwa-ra Chineke otuto nime Ya; Chineke gēnye kwa Ya otuto nime Onwe-ya, ngwa ngwa ka Ọ gēnye kwa Ya otuto. Umu-ntakiri, ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ. Unu gāchọm: dika M'gwa-kwa-ra ndi-Ju, si, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia; otú ahu ka M'nāsi unu ub͕u a. Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya. Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n'anya n'ebe ibe-unu nọ. Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, Òle ebe I nāla? Jisus zara, si, Ebe M'nāla, i pughi isom ub͕u a; ma i gēsom ma emesia. Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka m'nāpughi iso Gi ọbuná ub͕u a? m'gātọb͕ọ ndum n'ihi Gi. Jisus zara, si, Ì gātọb͕ọ ndu-gi n'ihim? N'ezie, n'ezie, asim i, Oke-ọkuku agaghi-akwa, rue mb͕e i gāgọnarim ub͕ò atọ.
Gụọ JỌN 13
Geere nke a ntị JỌN 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 13:31-38
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị