Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n'aka, na O si-kwa-ra n'ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke, O bilie na nri-anyasi, wusa uwe-Ya, we chiri ákwà anēji hicha aru, we ke Onwe-ya n'úkwù. Mb͕e ahu O tinye miri n'ihe anēji sa aru, we malite isa ukwu ndi nēso uzọ-Ya, na iji ákwà anēji hicha aru nke O kereri n'úkwù hicha ukwu-ha. Ya mere Ọ biakute Saimon Pita. Ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, Gì onwe-gi nāsa ukwum? Jisus zara, si Ya, Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.
Gụọ JỌN 13
Geere nke a ntị JỌN 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 13:3-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị