Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 13:18-30

JỌN 13:18-30 IGBOB

Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem. Site n'ub͕u a anamagwa unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere na Mu onwem bu Ya mb͕e ọ bula ọ gēru. N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānara onye ọ bula M'gēzite, Mu ka ọ nānara; onye nānaram nānara kwa Onye ziterem. Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, obi lọrọ Ya miri nime mọ-Ya, O we b͕a àmà, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, na otù onye n'etiti unu gāraram nye. Ndi nēso uzọ-Ya nēlerita onwe-ha anya, nēnwe obi abua onye Ọ nēkwu okwu bayere ya. Otù onye n'etiti ndi nēso uzọ-Ya nānọdu na nri nādabere n'obi Jisus, onye Jisus huru n'anya. Ya mere Saimon Pita fere onye ahu isi, we si ya, Gwa ayi onye O nēkwu okwu bayere ya. Onye ahu dabere, otú ọ di, n'obi Jisus, we si Ya, Onye-nwe-ayi, ònye ka ọ bu? Ya mere Jisus za, si, Ọ bu onye ahu, nke Mu onwem gēsuru iberibe achicha n'ofé, nye ya. Ya mere, mb͕e O susiri iberibe achicha ahu, O were ya nye Judas, nwa Saimon Iskariot. Mb͕e enyesiri ya iberibe achicha ahu, mb͕e ahu Setan batara nime onye ahu. Ya mere Jisus si ya, Ihe i nēme, me ya ọsọsọ. Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nọduru na nri mara ihe O ji gwa ya okwu a. N'ihi na ufọdu nēchè, ebe Judas ji àkpà-ego, na Jisus siri ya, Zuta ihe di ayi nkpà n'ememe; ma-ọbu, ka o nye ndi-ob͕eye ihe. Ya mere mb͕e ọ narasiri iberibe achicha ahu ọ pua ngwa ngwa: ma ọ bu abali.