Wuenu ulo, biri; kukwa-nu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha; luanu nwunye, mua umu-ndikom na umu-ndinyom; lu-kwa-ranu umu-unu ndikom nwunye, lu-kwa-ranu umu-unu ndinyom di, ka ha we mua umu-ndikom na umu-ndinyom; ba-kwa-nu uba n'ebe ahu, ghara ibilata. Chọ-kwa-nu udo nke obodo ahu nke M'meworo ka eme ka unu je biri n'ebe ahu, kpe-kwa-ranu Jehova ekpere bayere ya: n'ihi na n'udo-ya ka udo gādiri unu. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu ekwela ka ndi-amuma-unu ndi nọ n'etiti unu, na ndi-unu ndi nāju arusi ase, rafue unu, unu ege-kwa-la nti nrọ nile unu nke unu onwe-unu nēme ka arọ ha. N'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu n'aham: eziteghm ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a. N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.
Gụọ JEREMAIA 29
Geere nke a ntị JEREMAIA 29
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JEREMAIA 29:5-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị