Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, ihe ọjọ nāpu si n'otù mba jerue mba ọzo, agākpọte kwa oké ifufe site na nsọtu nile nke uwa. Ndi Jehova b͕uru gādizu kwa n'ubọchi ahu site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa: agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-achikọta kwa ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ. Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike. Ebe-nb͕alaga alanariwo kwa ndi-ọzùzù-aturu, nb͕apu alanariwo ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu. Ge nti olu iti-nkpu nke ndi-ọzùzù-aturu, na nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu! n'ihi na Jehova nēbibi ebe-ita-nri-ha. Emewo kwa ka ulo-obibi nile nke di n'udo dere du site n'iwe di ọku nke Jehova. Ọ rapuwo okwu-ọhia-Ya, dika ọdum: n'ihi na ala-ha aghọwo ihe-iju-anya site n'idi-ọku nke mma-agha nēme ihe-ike, na site n'iwe-Ya di ọku.
Gụọ JEREMAIA 25
Geere nke a ntị JEREMAIA 25
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JEREMAIA 25:32-38
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị