I ràwom urà, Jehova, ewe ràram: I jidewom, we nwe ike karim: aghọwom ihe-ichì-ọchì ogologo ubọchi nile, madu nile ọ bula nākwam emò. N'ihi na mb͕e ọ bula m'nēkwu, etim nkpu; Ihe-ike na Ipunara-madu-ihe, ka m'nākpọ nkpu: n'ihi na okwu Jehova ghọrọm ihe-ita-uta na ihe-ikwa-emò ogologo ubọchi nile. M'we si, M'gaghi-ehota Ya, m'gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n'aha-Ya. O we di n'obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n'ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike. N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n'udo, ndi nēche nche n'akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n'aru ya. Ma Jehova nọyerem dika dike nke nēme ka ama jijiji: n'ihi nka ndi nēsob͕um gāsu ngọngọ, ha agaghi-enwe kwa ike: ihere gēme ha nke-uku, n'ihi na ha enweghi uche, agaghi-echezọ ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi nke etiyere ha. Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nānwa onye ezi omume, Onye nāhu akuru na obi, ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha; n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpém. Bùkuenu Jehova abù, tonu Jehova: n'ihi na Ọ naputawo nkpuru-obi nke ob͕eye n'aka ndi nēme ihe ọjọ.
Gụọ JEREMAIA 20
Geere nke a ntị JEREMAIA 20
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JEREMAIA 20:7-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị