Jehova me-kwa-ram ka m'mara ya, m'we mara ya: mb͕e ahu ka I mere ka m'hu omume nile ha. Ma mu onwem di ka nwa-aturu azùbiri azùbi nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya; ma amaghm na ọ bu mu ka ha zubereri nzube megide, si, Ka ayi bibie osisi na ihe-oriri-ya, ka ayi bipu kwa ya n'ala ndi di ndu, ka ewe ghara icheta kwa aha-ya ọzọ. Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nēkpe ikpe n'ezi omume, Onye nānwa akuru na obi, kwe ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha: n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpem. N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi Anatot, bú ndi nāchọ ndu-gi, si, I gaghi-ebu amuma n'aha Jehova, ka i we ghara inwu site n'aka-ayi: n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a, Le, M'gaje iwere nmehie-ha leta ha: umu-okorọbia-ha gānwu site na mma-agha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gānwu site n'oké unwu; ọ dighi kwa ndi fọduru ha gēnwe: n'ihi na M'gēme ka ihe ọjọ biakute ndi Anatot, n'arọ nleta-ha.
Gụọ JEREMAIA 11
Geere nke a ntị JEREMAIA 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JEREMAIA 11:18-23
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị