Gideon nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom atọ na iri ndi siri n'úkwù onwe-ya puta: n'ihi na ọ nwere ọtutu ndinyom. Iko-ya nwayi nke nọ na Shekem, ya onwe-ya mu-kwa-ra ya nwa-nwoke, ọ gua ya aha Abimelek. Gideon nwa Joash we nwua n'ezi isi-awọ, elìe ya n'ílì Joash, bú nna-ya, n'Ọfra nke ndi Abieza. O rue, mb͕e Gideon nwuru, na umu Israel laghachiri, soro Bealim nākwa iko, doro onwe-ha Beal-berit ka ọ buru chi. Ma umu Israel echetaghi Jehova, bú Chineke-ha, Onye nānaputa ha n'aka ndi-iro-ha nile buruburu: ha emeghi kwa ulo Jerubeal, bú Gideon, ebere, dika ezi ihe nile si di nke o mere Israel.
Gụọ NDI-IKPE 8
Geere nke a ntị NDI-IKPE 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI-IKPE 8:30-35
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị