Manase anapughi ndi bi na Bet-shan na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, ala-ha: ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu. O rue, mb͕e Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n'ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha. Efraim anapughi kwa ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha; ndi Kenean we biri na Gezea n'etiti ha. Zebulun anapughi ndi bi na Kitron, na ndi bi na Nahalol, ala-ha; ndi Kenean we biri n'etiti ha, ghọ ndi nọ n'ifè-òfùfè. Asha anapughi kwa ndi bi n'Ako, na ndi bi na Zaidon, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, na Rehob, ala-ha: ndi Asha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi n'ala ahu: n'ihi na ha anapughi ha ala-ha. Naftali anapughi kwa ndi bi na Bet-shemesh, na ndi bi na Bet-anat, ala-ha; ha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi na n'ala ahu: ma ndi bi na Bet-shemesh na Bet-anat ghọrọ ndi nēfè ha òfùfè.
Gụọ NDI-IKPE 1
Geere nke a ntị NDI-IKPE 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI-IKPE 1:27-33
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị