Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEMES 5:1-12

JEMES 5:1-12 IGBOB

Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n'ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu. Àkù-unu erewo uré, uwe nile unu aghọwo kwa ihe nla ripiaworo. Ọla-edo-unu na ọla-ọcha-unu ab͕awo nchara; nchara-ha gāburu kwa unu ihe-àmà, ọ gēripia kwa anu-aru-unu dika ọku. Unu kpadoro àkù-unu na mb͕e ikpe-azu. Le, ugwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi bìri ọka n'ubi-unu, nke unu jidere na nmeb͕u, nēti nkpu: iti-nkpu nke ndi ahu ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha. Unu biri n'oké oriri na ọṅuṅu n'elu uwa, di kwa ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-unu utọ; unu zùru obi-unu n'ubọchi ob͕ub͕u. Unu mara ikpé, unu b͕uru onye ezi omume ahu; ọ dighi-edo onwe-ya imegide unu. Ya mere, umu-nnam, nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n'ebe ọ di, rue mb͕e ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu. Unu onwe-unu, nātachi-kwa-nu ogologo-ntachi-obi; menu ka obi-unu guzosie ike: n'ihi na ọbibia nke Onye-nwe-ayi di nso. Umu-nnam, unu atamuritala megide onwe-unu, ka ewe ghara ikpe unu: le, Onye-ikpé-ayi nēguzo n'iru ọnu-uzọ. Umu-nnam, natanu ndi-amuma ahu, bú ndi kwuru okwu n'aha Onye-nwe-ayi, dika ihe-ilere-anya nke ihuju-anya na nke ogologo-ntachi-obi. Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere. Ma nke kachasi ihe nile, umu-nnam, unu aṅula iyí, unu ejila elu-igwe, ma-ọbu ala, ma-ọbu ihe iṅu-iyi ọ bula ọzọ, ṅu iyi: kama ka e-unu buru e, ka é-è-unu buru kwa é-è; ka unu we ghara idabà n'okpuru ikpé.