Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEMES 1:9-16

JEMES 1:9-16 IGBOB

Ma ka nwa-nna nke nọ n'ọnọdu di ala nya isi n'ọnọdu-ya di elu: ma ka ọgaranya nya isi na emere ya ka ọ la ala: n'ihi na dika uzari ahihia ọ gāgabiga. N'ihi na anyanwu nāwalita, ifufe di ọku eso ya, o we kpọnwua ahihia; uzari-ya we dapu, nmá nke iru-ya we la n'iyì: otú a ka ọgaranya gātalata kwa n'ije-ya nile. Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n'ọnwunwa: n'ihi na mb͕e anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahu, bú ndu, nke Onye-nwe-ayi kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya. Ka onye ọ bula ghara isi, mb͕e anānwa ya, Anēsite n'aka Chineke anwam: n'ihi na Chineke bu Onye anāpughi iwere ihe ọjọ nwa Ya, Ya onwe-ya adighi-anwa kwa onye ọ bula: kama anānwa onye ọ bula mb͕e agu ihe ọjọ nke aka ya nādọkpufu ya, ewe rafue ya. Mb͕e ahu agua ihe ọjọ ahu, mb͕e ọ tuworo ime, o we muputa nmehie: nmehie ahu, mb͕e o tozuru okè, o we muputa ọnwu. Unu ekwela ka eduhie unu, umu-nnam ndi m'huru n'anya.