N'ihi ha ọ dighi nb͕achi gādiri nwanyi nke nkpà kpara. Na mb͕e mbu O mere ka elelia ala Zebulun na ala Naftali, ma na mb͕e ikpe-azu ka O meworo ka asọpuru ya, n'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan, Galili nke mba nile. Ndi nējeghari n'ọchichiri huru ìhè uku: ndi bi n'ala onyinyo ọnwu, ìhè amukwasiwo ha. I mewo ka mba ahu ba uba, I mewo ka ọṅù diri ya uku: ha aṅuriwo n'iru Gi dika ọṅù nke di n'owuwe-ihe-ubi, dika madu si eteghari egwú ọṅù mb͕e ha nēkasa ihe akwatara n'agha. N'ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n'aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n'ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n'ubọchi nke Midian. N'ihi na akpukpọ-ukwu ọ bula nke ndi-agha nēyi akpukpọ-ukwu n'ùzù agha, na uwe atururu n'ọbara, ha nile gābu ihe isure ọku, ọbuná nri ọku. N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.
Gụọ AISAIA 9
Geere nke a ntị AISAIA 9
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: AISAIA 9:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị