Ewe gosi ulo Devid, si, Siria nēzu ike n'elu Efraim. Obi-ya na obi ndi-ya we me nkpatu, dika osisi nile nke oké ọhia si eme nkpatu n'iru ifufe. Jehova we si Aisaia, Biko, pua izute Ehaz, gi onwe-gi, na Shea-jashub nwa-gi, rue nsọtu uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, rue uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà; si ya, Lezie anya, nọ kwa jū; atula egwu, ka obi-gi ghara kwa itu ujọ, site n'ọdudù abua ndia nke ọlọkọ-ọku nākwu anwuru-ọku, n'ihi iwe di ọku nke Rezin na Siria, na nke nwa Remalaia. N'ihi na Siria aduwo ọdu imegide gi ihe ọjọ, Efraim kwa, na nwa Remalaia, si, Ka ayi rigo imegide Juda, ka ayi me kwa ka ike gwusia ya, ka ayi wapuere onwe-ayi ya, me ka otù onye buru eze n'etiti ya, bú nwa Tabeel. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ gaghi-eguzosi ike, ọ gaghi-adi kwa.
Gụọ AISAIA 7
Geere nke a ntị AISAIA 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: AISAIA 7:2-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị