E, ezi-okwu aghọwo ihe anāhughi; ọzọ, onye nēsi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya nēme onwe-ya ihe-nkwata: Jehova we hu ya, ọ jọ njọ n'anya-Ya na ikpé ziri ezi adighi. O we hu na ọ dighi onye ọ bula di; ibobo we nwua Ya n'aru na ọ dighi onye nāriọrọ ayi aririọ: ogwe-aka-Ya we wetara Ya nzọputa; ezi omume-Ya kwa, nke ahu nākwagide Ya. O we yiri ezi omume dika uwe-agha, kpu kwa okpu-agha nzọputa n'isi-Ya; O yiri kwa uwe nile nke ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ha buru uwe-oyiyi-Ya, O were ekworo kpuchie Onwe-ya dika uwe-nwuda. Dika nmeso nile ha si di, otú a ka Ọ gākwughachi, ọnuma ka Ọ gākwughachi ndi nēmegide Ya, nmeso-ha ka Ọ gākwughachi ndi-iro-Ya; Ọ gākwughachi agwe-etiti nile nmeso-ha. Ha gātu kwa egwu aha Jehova site n'Ọdida-anyanwu, tu kwa egwu ebube-Ya site n'ọwuwa anyanwu: mb͕e onye-nkpab͕u gābata dika miri-iyi, Mọ nke Jehova ganēbuli ọkọlọtọ imegide ya. Otù onye-nb͕aputa gābiaru kwa Zaion, biakute ndi nēsi na njehie chigharia nime Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n'etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n'aru gi, na okwum nile nke M'tiyeworo n'ọnu-gi, agaghi-apu n'ọnu-gi, na n'ọnu nkpuru-gi, na n'ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
Gụọ AISAIA 59
Geere nke a ntị AISAIA 59
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: AISAIA 59:15-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị