Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 54:5-8

AISAIA 54:5-8 IGBOB

N'ihi na di-gi bu Onye meworo gi; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: ọzọ, onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke uwa nile ka anākpọ Ya. N'ihi na Jehova akpọwo gi dika nwanyi arapuru arapu nke o nēwuta kwa ya nime mọ-ya, bú nwunye alutara na nwata, mb͕e ajuru ya, ka Chineke-gi siri. N'otù ntabi-anya di ntà ka M'rapuworo gi arapu; ma obi-ebere nile di uku ka M'gēji chikọta gi. Na nrubiga-ókè nke iwe ka M'zonariri gi irum otù ntabi-anya; ma ebere ebighi-ebi ka M'gēji nwe obi-ebere n'aru gi, ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa-gi, siri.