N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka. Ala-ha juputa-kwa-ra n'ọla-ọcha na ọla-edo, ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù-ha; ala-ha juputa-kwa-ra n'inyinya, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ub͕ọ-ala-ha. Ala-ha juputa-kwa-ra n'ihe-efu; ọlu nke aka-ha ka ha nākpọ isi ala nye, bú ihe nke nkpisi-aka-ha mere. Madu we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala: ebupu-kwa-la nmehie-ha. Ba n'oké nkume, zobe kwa onwe-gi n'ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke idi-elu-Ya. Aghaghi ime anya npako nke madu ka ha di ala, aghaghi kwa iruda nbuli-elu nke ndi nile n'ala, aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu. N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala: ọ gādakwasi kwa osisi cedar nile nke Lebanon nke di elu nke ebuliwo-kwa-ra ha elu, ọ gādakwasi kwa osisi oak nile nke Beshan; ọ gādakwasi kwa ugwu nile nke di elu, ọ gādakwasi kwa ugwu ntà nile nke ebuliworo elu; ọ gādakwasi kwa ulo-elu ọ bula di elu, ọ gādakwasi kwa mb͕idi ọ bula ewusiri ike; ọ gādakwasi kwa ub͕ọ nile nke Tashish, ọ gādakwasi kwa ihe-ile-anya nile anāchọsi ike. Aghaghi kwa iruda npako madu, aghaghi kwa ime nbuli-elu nke ndi nile ka ọ di ala: aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu. Ma ihe-efu-ha, ha nile aghaghi igasi. Madu gābà kwa n'ọb͕à nile nke oké nkume nile, na n'olùlù nile nke ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku. N'ubọchi ahu madu gētufu ihe-efu-ya nile nke ọla-ọcha, na ihe-efu-ya nile nke ọla-edo, nke ha mere ka ọ we kpọ isi ala nye ha, ọ gētufu ha nye anu mole na usu; ka o we ba n'oghere nile nke oké nkume nile, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku. Rapunu madu, onye otù nku-ume di n'imi-ya: n'ihi na nìme gini ka aganāgu ya?