NDI-HIBRU 9:9-14
NDI-HIBRU 9:9-14 IGBOB
bú ulo-ikwū nke bu ulọ aturu oge nke di ub͕u a; anēche kwa ma onyinye ma àjà n'iru Chineke dika ulo-ikwū ahu si di, bú ihe nāpughi ime onye nēkpe ekpere ka o zu okè n'akuku akọ-na-uche, ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n'ihe ziri ezi, enyere n'iwu rue oge imezi ihe. Ma Kraist, ebe Ọ biara ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà nke ezi ihe nile gaje ibia, O sitere n'ulo-ikwū ahu nke ka uku na nke zuru okè kari, ọ bughi nke eji aka me, nke isi-ya bu, ọ bughi nke òkìkè a, O siteghi kwa n'ọbara nke ewu na nke umu-ehi, kama O sitere n'ọbara nke Ya onwe-ya, ba n'ebe nsọ nání otù mb͕e, ebe Ọ chọputara nb͕aputa ebighi-ebi. N'ihi na asi na ọbara nke ewu na nke oke-ehi, na ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi, mb͕e ọ nēfesa ndi emeruworo emeru, nēdo madu nsọ ime ka anu-aru-ha di ọcha: ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?

