unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya; N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu, O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari. Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu? Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie. Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu? N'ihi na ndi ahu nezí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu n'ezie ubọchi ole-na-ole otú ọ di ha nma; ma Ya onwe-ya nēzí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu ka o we bara ayi urù, ka ayi we keta idi-nsọ-Ya. Ozizí nile site n'inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n'oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n'udo, bú nkpuru nke ezi omume.
Gụọ NDI-HIBRU 12
Geere nke a ntị NDI-HIBRU 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI-HIBRU 12:5-11
7 Days
In a crowded Christmas season, most of us feel the stress and anxiety of family relationships, financial pressure, hasty decisions, and disappointed expectations. So go ahead. Take a breath. Start this Life.Church Bible Plan and realize the weight we feel may be something God never asked us to carry. How about we let go of the baggage? Let’s travel light.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị