Ma okwukwe bu ndabere nke ihe anēle anya, buru kwa nnwaputa nke ihe anāhughi anya. N'ihi na nime okwukwe ahu ka ab͕ara ndi okenye àmà. Okwukwe ka ayi ji ghọta na ewerewo okwu Chineke dozie uwa nile, ya mere esiteghi n'ihe putaworo ìhè kpu ihe ahu anāhu anya. Okwukwe ka Ebel ji che àjà n'iru Chineke nke ka àjà Kain chere nma, nke esitere na ya b͕ara ya àmà na ọ bu onye ezi omume, ebe Chineke b͕ara àmà bayere onyinye-ya nile: o site kwa na nke ahu nēkwu okwu ub͕u a, ọ bu ezie na ọ nwuru anwu. Okwukwe ka eji būbiga Inok ka ọ ghara ihu ọnwu; ahughi kwa ya, n'ihi na Chineke bubigara ya-ri: n'ihi na mb͕e akēbubigaghi ya ab͕aworo ya àmà na ihe ọ nēmeri nātọ Chineke ezi utọ: ma asi na okwukwe adighi ọ bu ihe anāpughi ime, bú ime ihe gātọ Chineke ezi utọ: n'ihi na onye nābiakute Chineke aghaghi ikwe na Ọ di, na Ọ nēgosi kwa Onwe-ya Onye nēnyeghachi ndi nāchọ Ya ugwọ-ọlu. Noa, mb͕e Chineke dusiri ya ọdu bayere ihe akāhughi anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwu Chineke, ọ bu okwukwe ka o ji dozie ub͕ọ izọputa èzí-na-ulo-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n'uzọ okwukwe. Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje. Okwukwe ka o ji biri dika ọbìa n'ala nke ekwere ya-ri na nkwa, dika ala nābughi nke aka ya, ebe o biri n'ulo-ikwū, ya na Aisak na Jekob, ndi soro ya nēketakọ otù nkwa ahu: n'ihi na ọ nēle anya obodo ahu nke nwere ntọ-ala ahu, nke Chineke bu onye-ọ̀kà-ya na onye luru ya.
Gụọ NDI-HIBRU 11
Geere nke a ntị NDI-HIBRU 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI-HIBRU 11:1-10
3 Ụbọchị
Mgbaghara bụ otu ibe dị oke mkpa na ndụ onye Kraịst, maka iji nwee udo na udi mmekọrịta na-eto eto n’ebe ya na Chineke na mmadu nọ. Ọ bụghị naanị na Jizọs ji ndụ ya kọwarịgharịa mgbaghara site na nkuzi ya, o nyekwazịrị amara achọrọ iji nara ma nyekwa mgbaghara site na Mmụọ ya. Enyela nwa Chineke ọbụla ike irube isi n’iwu Chineke nyere ka agbaghara ndị ọzọ otu e si gbaghara ha.
7 Ụbọchị
Ibi ndụ ọñụ, nke jupụtara n'nzube dabere na mmekọrịta, ịhụnanya na okwukwe. Ọ bụrụ na ị ka chọrọ idoanya karịa na atụmatụ Chineke maka ndụ gị, tinye atụmatụ a iji nyere aka lekwasị anya na nchụso gị na nchọta gị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị