N'ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n'otù àjà ndia nke ha nēche n'iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile. N'ihi na ma ọ dighi otú a, àgaghi-echebìwori ha n'iru Chineke, n'ihi na ndi nēkpe ekpere, ebe emeworo ka ha di ọcha otù mb͕e, ha agaghi-enwe akọ-na-uche ọ bula nke nmehie di iche iche ọzọ? Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ. N'ihi na ọbara nke oke-ehi na nke ewu apughi iwepu nmehie. N'ihi nka mb͕e Ọ nābia n'uwa, Ọ si, Àjà na ihe echere n'iru Gi, I chọghi ha, Ma aru ka I kwadebere nyem; Àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, ha abughi ihe di Gi ezi nma: Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom (N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem) Ime ihe I nācho, Chineke. Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n'iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n'iru Chineke dika iwu si di), mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo. Ọ bu kwa n'ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n'iche aru Jisus Kraist n'iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e.
Gụọ NDI-HIBRU 10
Geere nke a ntị NDI-HIBRU 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI-HIBRU 10:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị