N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta? ọzọ kwa, Mu onwem gāburu Ya Nna, Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara? Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya. Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si, Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe, Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu: ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si, Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi; Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa. I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì; N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere Gi Manu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.
Gụọ NDI-HIBRU 1
Geere nke a ntị NDI-HIBRU 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI-HIBRU 1:5-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị