Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n'elu ebube-gi. N'ihi na ihe-ike emere Lebanon gēkpuchi gi, na nbibi nke anumanu di iche iche, nke mere ka ha tua ujọ; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya. Ùrù gini ka arusi apiri api bara, na onye nēme ya apiwo ya? ùrù gini ka arusi awuru awu na onye-ozízí okwu-ugha bara, na onye nākpu ihe-ya akpuru akpu atukwasiwo ya obi, ime arusi dara ob͕i di iche iche? Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya. Ma Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ: dere du n'iru Ya, gi uwa nile.
Gụọ HABAKUK 2
Geere nke a ntị HABAKUK 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: HABAKUK 2:16-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị